Ózị́ ńà é méchị́rị́ LAUTECH màkà ńwákpó ńdị́ ọ́mékọ́mé bụ̀ ásị́

N’ụbọchị Monde, ótù onye na X, bụ Rasaq Hammed, kwụrụ na mahadum Ladoke Akintola University of Technology (LAUTECH) dị na Ogbomoso na Oyo steetị, bụ nke e mechịrị n’ịhị nwakpo ndị omekome n’ụlọakwụkwọ ahụ.

Okwụ ya na-abịa n’etiti ngagharị iwe nke ndị òtù Take It Back Movement na ụfọdụ ndị nkụzi na Ibadan mere maka ntọrọ umuakwukwo iri atọ n’itolu na ndị nkụzi asaa n’ụlọakwụkwọ atọ na ogige Oriire nke Ogbomoso, nke mere n’ụbọchị iri n’ise nke ọnwa May.

Ndị ntọrọ ahụ gbụrụ osote onye ịsị ndị nkụzi na onye na-anya ọgba tụm tụm n’ụlọ akwụkwọ Community High School dị́ na Ahoro Esiele, otu n’ime ụlọakwụkwọ ndị ntorobịa ahụ wakporo.

Ka ụfọdụ ụbọchị gachara, ndị ntọrọ mmadu ahụ bepụrụ ịsị Michael Oyedokun, otu n’ime ndị nkụzi ahụ, dịka ha kedoro ya n’osisi.

Nya bụ ihe kpalitere iwe n’obi ndị mmadụ nke mere ka ọtụtụ ndị mee ngagharị iwe.

N’ụbọchị Mọnde, ndị na-eme ngagharị iwe gara n’ụlọ gọọmenti house dị na Ibadan, ebe ha na ayo ka atọghapụ umuakwukwo na ndị nkụzi ahụ n’aka ndị ntọrọ mmadụ  ahụ.

Hammed kwụrụ na n’ihi ọgbaghara sitere na ntọrọ ahụ, a kpọchiela LAUTECH, ma gwa nne na nna ka ha bịa kpọrọ ụmụ aka ha.

“Ndị ịsị  ụlọakwụkwọ LAUTECH a kpochiela mahadum ahụ ya taa, n’ihi nwakpo ndị omekome n’ụlọ akwụkwọ ahụ,” onye ahụ dere.

“Ndị nne na nna bịa kpọrọ nụ ụmụ unu. Mgbe ha na-abịa, ha sikwa ụzọ Iseyin nke gara Ibadan, maka na ndi oji egbe-egbu nọ n’ime Ogbomosho.”

Onye ahu tinyere aha Seyi Makinde, gọvanọ steetị ahụ, na onye isiala Bola Tinubu, ma kwụo si: “e chere m n’unu abụọ kwesiri ịchịdebe ọchịchị m’ọbụrụ n’unu agaghị echekwa ndị mmadụ”.

Ụfọdụ ndị na X, Facebook kesera nya bụ ozị dịka anyị hutara ebe a, n’ebe a, bụ nke e kesakwara na WhatsApp.

ŃNYÓCHÁ

N’ozi mbipụta nke ụlọakwụkwọ ahụ bipụtara n’ụbọchị iri abụọ nke ọnwa May, ndị isi ụlọakwụkwọ ahụ gwara umuakwukwo ka ha gaa ezumike otu izu ụka iji mee mmeme Eid-el-Kabir.

Ozi ahụ kwụrụ na ọmụmụ na nkụzi ga-ebido n’ụbọchị mbụ nke ọnwa June.

Kamgbe ụbọchị iri abụọ n’anọ nke ọnwa May, mgbe ụlọakwụkwọ ahụ bipụtachara nya bụ ozị na asafe X na Facebook ya, o bipụtabeghị ozị ọzọ na-ekwu na a gbanwola ụbọchị umuakwukwo kwesịrị ịbido ọmụmụ.

Lekan Fadeyi, onye nkwuchita ọnụ ụlọakwụkwọ LAUTECH, gwara TheCable na ozi Hammed bụ “ezigbote asi”, o kwụrụ na ụmụ akwụkwọ bidoro ọmụmụ na Mọnde, ma gaa n’ihu lee ile testị nke ha kwesiri ile ha maobughị maka ezumike Salah.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Ozị na ndị omekome wakporo LAUTECH bụ asị.

About admin

Check Also

Troops rescue abducted victim, recover 318 rustled livestock in Katsina forest raid

Troops of the Nigerian Army have rescued a kidnapped victim and recovered 318 rustled livestock …

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *